Jọn 12:35-45 Bible Nso (IGBOB)

35. Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n'etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n'ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje.

36. Mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, kwerenu n'Ìhè ahu, ka unu we ghọ umu Ìhè.Ihe ndia ka Jisus kwuru, O we je zonari ha Onwe-ya.

37. Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n'iru ha, ma ha ekweghi na Ya:

38. ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si,Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya?

39. N'ihi nka ha apughi ikwere, n'ihi na Aisaia siri ọzọ,

40. O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili;Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta,Ghara kwa ichighari,Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.

41. Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n'ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu-kwa-ra okwu bayere Ya.

42. Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ:

43. n'ihi na ha huru otuto madu n'anya kari otuto Chineke.

44. Jisus we tie nkpu, si, Onye kwere na Mu, ọ bughi na Mu ka o kwere, kama ọ bu n'Onye ziterem.

45. Onye nāhum nāhu kwa Onye ziterem.

Jọn 12