35. Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n'etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n'ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje.
36. Mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, kwerenu n'Ìhè ahu, ka unu we ghọ umu Ìhè.Ihe ndia ka Jisus kwuru, O we je zonari ha Onwe-ya.
37. Ma ọ bu ezie na O mereri ọtutu ihe-iriba-ama di otú a n'iru ha, ma ha ekweghi na Ya:
38. ka okwu Aisaia onye-amuma we mezu, nke o kwuru, si,Onye-nwe-ayi, ònye kwere ihe ayi nuworo?Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya?