27. Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam:
28. Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam.
29. Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n'aka Nnam.
30. Mu onwem na Nnam bu otù.
31. Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya.
32. Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume?