Jọn 10:23-34 Bible Nso (IGBOB)

23. Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon.

24. Ya mere ndi-Ju nọgidere Ya buruburu, we si Ya, Ì nākwuba nkpuru-obi-ayi n'elu rue ole mb͕e? Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, gwawa ayi.

25. Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n'aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà.

26. Ma unu onwe-unu adighi-ekwe, n'ihi na unu adighi nime aturu nkem.

27. Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam:

28. Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam.

29. Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n'aka Nnam.

30. Mu onwem na Nnam bu otù.

31. Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya.

32. Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume?

33. Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke.

34. Jisus zara ha, si, Èdeghi ya n'iwu-unu, si, Mu onwem siri, Chi ka unu bu?

Jọn 10