34. Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke.
35. Ọzọ n'echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya;
36. o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke!
37. Madu abua ahu ndi nēso uzọ-ya we nu ka ọ nēkwu, ha we so Jisus.