Joel 2:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. Dika ndi-dike ka ha nāb͕a ọsọ; dika ndi-agha ka ha nārigo mb͕idi; onye ọ bula n'uzọ-ya nile, otú a ka ha nāga ije, ha adighi-agwab͕u kwa agwab͕u n'ojije nile ha.

8. Ha adighi-enurita onwe-ha; onye ọ bula n'uzọ-ya atuliri atuli, otú a ka ha nāga ije: ọ bu kwa n'etiti ihe-agha ka ha nāda nējebìghi ije-ha.

9. N'obodo ka ha nāb͕aghari; n'elu mb͕idi ka ha nāb͕a ọsọ; n'ulo ka ha nārigobata; ha si na window nile abà nime dika onye-ori.

10. N'iru ha ka ala maworo jijiji; elu-igwe emewo nkpatu: anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha:

11. Jehova emewo kwa ka olu-Ya da n'iru usu-ndi-agha-Ya; n'ihi na ihe bara uba nke-uku ka ọmuma-ulo-ikwū-Ya bu; n'ihi na onye nwere ume ka onye nēme ihe O kwuru bu: n'ihi na ubọchi Jehova di uku di kwa egwu nke-uku; ònye kwa gānagide ya?

12. Ma ọbuná ub͕u a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), werenu obi-unu nile, werekwa obubu-ọnu, were kwa ikwa-ákwá, were kwa iti-aka-n'obi, chigharikutem:

13. dọwa-kwa-nu obi-unu, adọwa-kwa-la uwe-unu, chigharikute Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Onye-amara na Onye-obi ebere ka Ọ bu, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere, Ọ nēcheghari kwa uche bayere ihe ọjọ ahu Ọ gēweta.

14. Ònye mara? eleghi anya O gēchighari, chègharia uche, me ka ngọzi fọdu n'azu Ya; bú onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu inye Jehova, bú Chineke-unu.

15. Fùanu opì-ike nime Zaion, donu obubu-ọnu nsọ, kpọsanu ubọchi nb͕ochi:

Joel 2