23. Umu Zaion, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, ṅuri kwa na Jehova, bú Chineke-unu: n'ihi na Ọ nēnye unu miri-ozuzo mbu ka ezi omume-Ya si di, me kwa ka oké miri-ozuzo zodatara unu, bú miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, n'ọnwa mbu.
24. Ebe-nzọcha-ọka nile gējuputa kwa n'ọka wheat, ebe-inara-manya-vine na manu gērubiga kwa na manya-vine ọhu na manu ọhu.
25. M'gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M'zitere n'etiti unu.
26. Unu gēriju afọ, afọ ewe ju unu, unu ewe to aha Jehova, bú Chineke-unu, Onye mesoworo unu n'ilu oké ọlu: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e ebighi-ebi.
27. Unu gāma kwa na n'etiti Israel ka M'nọ, na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, na ọ dighi onye ọzọ: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e abighi-ebi.