8. Onye nání Ya nēseti elu-igwe,Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu.
9. Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades,Na ime-ulo nke Ndida.
10. Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi;Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi.
11. Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya:Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya.
12. Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu?Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme?
13. Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi;Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya.
14. Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya,Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya?
15. Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya;Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara.
16. Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam;M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum;
17. Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru,Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.
18. Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu,Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.