24. Enyewo uwa n'aka onye-nmehie:Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya;Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?
25. Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ:Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.
26. Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì:Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.
27. Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum,Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum:
28. Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile,Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
29. Agama mu onwem ikpe;N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu?
30. Ọ buru na ewerem miri snow sa arum,Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;