17. Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru,Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.
18. Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu,Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.
19. Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya!Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?
20. Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe:Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.
21. Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim;Ajum ndum.
22. Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri,Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.
23. Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya,Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.
24. Enyewo uwa n'aka onye-nmehie:Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya;Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?
25. Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ:Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.
26. Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì:Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.
27. Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum,Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum:
28. Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile,Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
29. Agama mu onwem ikpe;N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu?
30. Ọ buru na ewerem miri snow sa arum,Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;
31. Mb͕e ahu I gābiayem n'olùlù,Uwem gākpọkwam ihe-árú.
32. N'ihi na Ọ bughi madu, otú m'bu, na m'gāza Ya,Na ayi gābiakota n'ikpé.
33. Ọ dighi odozi-okwu di n'etiti ayi,Nke gātukwasi ayi abua aka-ya.
34. Ya wezuga nkpa-n'aka-Ya n'arum,Ka oké ujọ-Ya ghara ime ka m'tua egwu nke-uku:
35. Ka m'kwue okwu, ghara itu egwu Ya;N'ihi na ọ bughi otú a ka m'di n'ebe mu onwem nọ.