Job 9:15-30 Bible Nso (IGBOB)

15. Onye, ọ buru na abum onye ezi omume, m'gaghi-aza Ya;Kama m'gāriọ onye nēkpem ikpe aririọ-amara.

16. Ọ buru na m'kpọwo òkù, O we zam;M'gaghi-ekwe kwa na Ọ ṅara nti n'olum;

17. Bú Onye nēji oké ifufe chifiam aru,Onye nēme kwa ka ob͕ub͕u-mmam, bú nke eb͕urum, ba uba n'efù.

18. Ọ gaghi-ekwem ka m'turu ndu,Kama Ọ nēme ka afọ jum n'ihe-ilu nile.

19. Ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ike nke onye nwe ume, le, Ọ nọ ya!Ma ọ buru na ayi ekwue okwu bayere ikpé, ònye gākaram mb͕e?

20. Ọ buru na abum onye ezi omume, ọnum gāmam ikpe:Onye zuru okè ka m'bu, o we si na abum onye b͕agọrọ ab͕agọ.

21. Onye zuru okè ka m'bu; adighm-amara nkpuru-obim;Ajum ndum.

22. Otù ihe aju ka ọ bu; n'ihi ya ka m'siri,Onye zuru okè na onye nēmebi iwu ka Ya onwe-ya nēme ka ha gwusia.

23. Ọ buru na utari eme ka madu nwua n'otù ntabi-anya,Ọ gāchì onwunwa onye nēmeghi ihe ọjọ ọchì.

24. Enyewo uwa n'aka onye-nmehie:Ọ nēkpuchi iru ndi-ikpe-ya;Ọ buru na ọ bughi Ya, ònye kwa ka ọ bu?

25. Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ:Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.

26. Ha agabigawo n'iru dika ub͕o amì:Dika ugo si efedakwasi ngwa ngwa n'anu ọ gēri.

27. Ọ buru na asim, Ka m'chezọ ntamum,Ka m'rapu iru ujọm, b͕asa irum:

28. Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile,Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

29. Agama mu onwem ikpe;N'ìhi gini kwa ka m'dọb͕uru onwem n'ọlu n'efu?

30. Ọ buru na ewerem miri snow sa arum,Were kwa nchà me ka ọbu-akam abua di ọcha;

Job 9