Job 9:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we za, si,

2. N'ezie amawom na ọ di otú a:Ma madu, ò gēsi aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke?

3. Ọ buru na ọ tọ ya utọ iso Ya je n'ikpé,Ọ gaghi-aza Ya otù okwu nime nnù okwu abua na ọgu iri.

4. O nwere obi nke mara ihe, Ọ nāb͕a kwa ume n'ike:Ònye mere onwe-ya ka o sie ike imegide Ya, we nọ n'udo?

5. Onye nākwapu ugwu, ma ha amaghi ya,Mb͕e Ọ kwatuworo ha n'iwe-Ya.

6. Onye nēme ka uwa me nkpatu pua n'ọnọdu-ya,Ogidi-ya nile we ma jijiji.

7. Onye nāgwa anyanwu okwu, o we ghara iwa;Ọ nākachi kwa kpakpando akàrà.

8. Onye nání Ya nēseti elu-igwe,Nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke oké osimiri ukwu.

9. Onye nēme Bear, na Orion, na Pleiades,Na ime-ulo nke Ndida.

10. Onye nēme ihe uku, rue mb͕e ngwuputa ala-ha nādighi;Na oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu nādighi.

11. Le, Ọ nāgabiga n'akukum, ma adighm-ahu Ya:Ọ nāga kwa n'iru, ma adighm-amata Ya.

12. Le, Ọ nānwude ihe, ònye gēme ka Ọ laghachi azu?Ònye gāsi Ya, Gini ka I nēme?

13. Chineke agaghi-eme ka iwe-Ya laghachi;Ndi nēyere Rehab aka ruru ala n'okpuru Ya.

14. Mù onwem gēsi kwa aṅa za Ya,Rọputa kwa okwum nile m'gāgwa Ya?

Job 9