12. Mb͕e ọ nọ n'ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya,Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu.
13. Otú a ka okporo-uzọ ndi nile nēchezọ Chineke si di;Olile-anya nke onye emeruru emeru gāla n'iyì:
14. Onye agākpaji okwukwe efu ya,Ntukwasi-obi-ya bu kwa ulo ududo.
15. Ọ gādabere n'aru ulo-ya, ma ọ gaghi-eguzo:Ọ gējide ya, ma ọ gaghi-eguzosi ike.
16. Dika osisi ndu ka ọ di n'iru anyanwu,Ome-ya nēpusa n'ubi-ya ab͕ara ogige.
17. Nkpọrọgwu-ya nēkekọta onwe-ha n'aru obo nkume,Ọ nāhu ebe nkume anya.