11. Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum;Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm;Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
12. Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri,Na I nēdo ndi-nche ichem?
13. Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi,Ihe-ndinam gēbupu ntamum;
14. I we were nrọ me ka m'tua ujọ,I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:
15. Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u,Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.