18. Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha;Ha nārigo n'ebe tọb͕ọrọ n'efu, we la n'iyì.
19. Ndi-ije nke Tima legidere anya,Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.
20. Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi;Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.
21. N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe;Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.
22. Ọ̀ bu na m'siri, Nyenum ihe?Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n'ihim site n'àkù-unu?
23. Ma-ọbu, Wepuganum n'aka onye-nkpab͕u?Ma-ọbu, B͕aputanum n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji?