5. Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya,Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya,Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.
6. N'ihi na ajọ ihe adighi-esi n'ájá puta,Ọ bughi kwa n'ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa;
7. Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ,Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.
8. Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke,Chineke ka m'gēbo kwa okwum:
9. Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi;Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:
10. Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala,Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi: