4. Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa;M'gāju Gi, Gi me kwa ka m'mara.
5. Site n'ọnunu nti ka m'nuru Gi;Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi.
6. N'ihi nka ka m'nāju onwem aju, we chèghariaN'elu ájá na ntu.
7. O rue, mb͕e Jehova gwasiri Job okwu ndia, na Jehova siri Elifaz, bú onye Timan, Iwem di ọku megide gi, megide kwa ndi-eyì-gi abua: n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuworo.
8. Ma ub͕u a, chirinu n'onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n'ihi na n'ezie ọ bu ya ka M'gāhu iru-ọma, ka M'ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru.