Job 40:19-24 Bible Nso (IGBOB)

19. Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke:Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.

20. N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya;Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.

21. N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina,N'ebe nzuzo nke amì, na apiti.

22. Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya;Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu.

23. Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji:Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya.

24. Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya?Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya?

Job 40