Job 40:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya;Ọ nāta ahihia dika ehi.

16. Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya,Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.

17. Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar:Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.

18. Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi;Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.

19. Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke:Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.

20. N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya;Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.

21. N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina,N'ebe nzuzo nke amì, na apiti.

Job 40