13. Zobekọ ha n'ájá;Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo.
14. Emesia Mu onwem gēkele kwa gi,Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.
15. Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya;Ọ nāta ahihia dika ehi.
16. Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya,Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.
17. Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar:Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.
18. Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi;Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.
19. Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke:Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.