Job 40:10-16 Bible Nso (IGBOB)

10. Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma;Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi.

11. Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi:Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala.

12. Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala;Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha.

13. Zobekọ ha n'ájá;Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo.

14. Emesia Mu onwem gēkele kwa gi,Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.

15. Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya;Ọ nāta ahihia dika ehi.

16. Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya,Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.

Job 40