Job 4:5-19 Bible Nso (IGBOB)

5. Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi;Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.

6. Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi?Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?

7. Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ?Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?

8. Dika m'huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi,Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi.

9. Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì,Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.

10. Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja,Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo.

11. Oke-ọdum nāla n'iyì site n'enweghi ihe ọ dọb͕utara,Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha.

12. Ma mu ka ezutara okwu n'ori nye,Ntim we nara ntakwu nke sitere na ya.

13. N'èchìchè sitere n'ọhù nile nke abali,Mb͕e oké ura nādakwasi madu,

14. Oké egwu zuterem, ya na ima-jijiji,O we me ka ọtutu ọkpukpum tua oké egwu.

15. Otù mọ we gabiga n'irum;Aji anu-arum we guzo ọtọ.

16. Ọ nēguzo eguzo, ma amataghm otú ọ di n'ile ya anya;Otù udi di n'iru anyam:Idebe-ọnu-du di, ma olu ka m'nānu, si,

17. Madu, ọ̀ gābu onye ezi omume kari Chineke?Nwòke gādi ọcha kari Onye kèworo ya?

18. Le, ọbuná ndi-orù-Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ nēbo ebubo na ha bu ndi-nmehie:

19. Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n'ulo urọ?Nke ntọ-ala-ha di n'ájá,Ndi anāzọpia azọpia dika nla.

Job 4