4. Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike,I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.
5. Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi;Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.
6. Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi?Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?
7. Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ?Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?
8. Dika m'huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi,Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi.
9. Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì,Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.
10. Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja,Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo.
11. Oke-ọdum nāla n'iyì site n'enweghi ihe ọ dọb͕utara,Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha.
12. Ma mu ka ezutara okwu n'ori nye,Ntim we nara ntakwu nke sitere na ya.
13. N'èchìchè sitere n'ọhù nile nke abali,Mb͕e oké ura nādakwasi madu,
14. Oké egwu zuterem, ya na ima-jijiji,O we me ka ọtutu ọkpukpum tua oké egwu.