1. Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2. Asi na otù onye anwa igwa gi okwu, ìke gāgwu gi?Ma ònye puru ib͕ọchi onwe-ya n'ikwa okwu?
3. Le, i dọwo ọtutu madu, aka na nti,I nēme kwa ka aka nke nādighi ike di ike.
4. Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike,I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.
5. Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi;Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.