Job 4:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2. Asi na otù onye anwa igwa gi okwu, ìke gāgwu gi?Ma ònye puru ib͕ọchi onwe-ya n'ikwa okwu?

3. Le, i dọwo ọtutu madu, aka na nti,I nēme kwa ka aka nke nādighi ike di ike.

4. Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike,I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.

5. Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi;Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.

6. Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi?Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?

7. Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ?Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?

8. Dika m'huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi,Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi.

9. Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì,Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.

10. Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja,Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo.

11. Oke-ọdum nāla n'iyì site n'enweghi ihe ọ dọb͕utara,Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha.

12. Ma mu ka ezutara okwu n'ori nye,Ntim we nara ntakwu nke sitere na ya.

Job 4