Job 39:11-20 Bible Nso (IGBOB)

11. Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne?Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?

12. Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi,Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?

13. Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu;Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?

14. N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala,Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,

15. O we chezọ na ukwu gāzọpia ha,Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.

16. O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere:Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;

17. N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe,O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.

18. Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ,Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.

19. Ì nēnye inyinya idi-ike-ya?Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?

20. Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube?Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.

Job 39