Job 39:10-16 Bible Nso (IGBOB)

10. Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi?Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?

11. Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne?Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?

12. Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi,Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?

13. Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu;Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?

14. N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala,Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,

15. O we chezọ na ukwu gāzọpia ha,Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.

16. O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere:Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;

Job 39