12. Anēchighari kwa nke ahu buruburu site n'okpukpe-Ya,Ka ha we me ihe ọ bula nke Ọ nēnye ha n'iwuN'elu-uwa dum madu bi:
13. Ma ọ bu n'ihi nkpa-n'aka, ma-ọbu n'ihi uwa-Ya,Ma-ọbu n'ihi ebere, ka Ọ nēme ka ọ biarue.
14. Ṅa nti na nka, Job:Guzo, ghọta oké ọlu nile nke Chineke.
15. Ì mara otú Chineke nēnye ha iwu,Nēme kwa ka ìhè igwe-oji-Ya mua?