Job 36:23-30 Bible Nso (IGBOB)

23. Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya?Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?

24. Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku,Bú nke madu bùworo abù bayere ya.

25. Madu nile elewo ya anya;Madu nēlegide ya site n'ebe di anya.

26. Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya;Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.

27. N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri,Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya:

28. Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n'uba.

29. Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-ojiNbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya?

30. Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya;Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.

Job 36