13. Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi:Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.
14. Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata,Ndu-ha nāla kwa n'iyì n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko.
15. Ọ nādọputa onye ewedara n'ala na nweda-n'ala-ya.Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u.
16. Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕uBa n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya;Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.
17. Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu:Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.