Job 34:26-30 Bible Nso (IGBOB)

26. Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha akaN'ọnọdu ndi nāhu ha anya;

27. N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha,Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:

28. Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo,Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.

29. Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe?Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya?Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:

30. Ka madu emeruru emeru we ghara ibu eze,Ka ndi nēsiri ndi ahu ọnya we ghara idi.

Job 34