Job 34:19-27 Bible Nso (IGBOB)

19. Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma,Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike?N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.

20. N'otù ntabi-anya ka ha gānwu, ọbuná n'etiti abali;Anēme ka ndi ahu me nkpatu, ha nāgabiga kwa,Anēwezuga kwa onye di ike, nēweghi aka ọ bula.

21. N'ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu,Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa.

22. Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di,Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.

23. N'ihi na Ọ dighi-atukwasi madu ihe ọzọ,Ọ bu nání ijekuru Chineke n'ikpé.

24. O nētijisi ndi di ike, ma ngwuputa-ala-ya adighi,Ọ we neguzo ndi ọzọ n'ọnọdu ha.

25. N'ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha;O we nēkpù ha iru n'abali, ewe zọpia ha.

26. Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha akaN'ọnọdu ndi nāhu ha anya;

27. N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha,Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:

Job 34