Job 33:16-22 Bible Nso (IGBOB)

16. Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu,Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,

17. Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya,Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;

18. Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù,Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.

19. Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya,Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile:

20. Nri we nāsọ ndu-ya oyi,Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi.

21. Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya;Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu.

22. Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù,Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.

Job 33