Job 32:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si,Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká;N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara.

7. Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu,Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe.

8. N'ezie mọ di nime madu,Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.

9. Ọ bughi ndi uku mara ihe,Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.

10. N'ihi nka ka m'siri, Gem nti;M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.

11. Le, echerem okwu-unu,Anamaṅa nti nghọta-unu,Rue mb͕e unu gēgwuputa ala okwu nile.

12. E, anamelekwasi unu anya,Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka,Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n'etiti unu.

Job 32