13. Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe;Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu:
14. N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem;M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya.
15. Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ:Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha.
16. M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu,N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ?
17. M'gāza òkèm, ọbuná mu onwem,M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.
18. N'ihi na ejuputaram n'okwu;Mọ nke di n'afọm akpab͕uwom.
19. Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu;Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa.