1. Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya.
2. Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n'ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ọ guru onwe-ya n'onye ezi omume kari Chineke.
3. Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe.
4. Ma Elaihu chere Job n'ikwu okwu, n'ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n'ubọchi ndu-ha.
5. Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n'onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku.
6. Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si,Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká;N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara.
7. Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu,Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe.
8. N'ezie mọ di nime madu,Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.
9. Ọ bughi ndi uku mara ihe,Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.
10. N'ihi nka ka m'siri, Gem nti;M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.