4. Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile,Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?
5. Ọ buru na mu na ihe-efu yikọrọ jeghari,Ọ buru kwa na ukwum ab͕aso aghughọ ọsọsọ;
6. (Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume,Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)
7. Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya,Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu,Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:
8. Ka m'gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie;Ka eropu kwa umu nke putara n'arum.
9. Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi,M'we che anwu n'ọnu-uzọ madu-ibem:
10. Ka nwunyem gwere nwoke ọzọ nri,Ka ndikom ọzọ ruru kwa ala n'elu ya.
11. N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ;Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:
12. N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia,Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.
13. Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi,Mb͕e mu na ha nēse okwu: