36. N'ezie n'ubum ka m'gēburu ya;M'gēke kwa ya n'isim dika okpu-eze.
37. M'gēgosi Ya ọnu-ọgugu nzọ-ukwum;Dika onye-ndú ka m'gābiaru Ya nso.
38. Ọ buru na alam etie nkpu megidem,Ọ buru kwa na ọ̀b͕à-ya nile akwakọ ákwá;
39. Ọ buru na eriwom ihe-ọmume-ya nēnyeghi ego,Ma-ọbu me ka ndi-nwe-ya kubìe ume-ndu-ha:
40. Ka ọhia-ogwu puta n'ọnọdu ọka wheat,Ka ahihia nēsì ísì ọjọ puta kwa n'ọnọdu ọka barley.Okwu Job agwusia.