Job 31:20-26 Bible Nso (IGBOB)

20. Ọ buru na úkwù-ya agọzighm,Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;

21. Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei,N'ihi na m'nāhu onye-iye-akam n'ọnu-uzọ-ama:

22. Ka ubum si n'azu-ubu-ya dapu,Ka etijipu kwa ogwe-akam n'ọkpukpu-ya.

23. N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu,Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.

24. Ọ buru na emewom ọla-edo ka ọ buru okwukwe efum,Ọ buru kwa na asiwom ọla-edo ọma, I bu ntukwasi-obim;

25. Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne,Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku;

26. Ọ buru na ajum ìhè mb͕e o nēnwu,Ma-ọbu ọnwa mara nma mb͕e ọ nāga ije;

Job 31