15. Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya?Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?
16. Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ,Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;
17. Ọ buru kwa na eriem nbì-aka-nrim, náním,Ma nwa-nb͕ei erighi nime ya;
18. (Kama site na mb͕e m'di na nwata o tozuru n'akam dika n'aka nna-ya,Ọ bu kwa site n'afọ nnem ka m'buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú;)