11. N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ;Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:
12. N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia,Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.
13. Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi,Mb͕e mu na ha nēse okwu:
14. Gini ka m'gēme kwa mb͕e Chineke nēbili?Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m'gāzaghachi Ya?
15. Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya?Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?
16. Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ,Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;