16. Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri;Ubọchi nweda-n'ala nējidem.
17. N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum,Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.
18. Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari:Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.
19. Ọ tubàwom n'apiti,M'we yie ájá na ntu.
20. Anametiku Gi, ma I dighi-azam:Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.
21. I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere:I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.
22. I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya,I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.