Job 30:11-26 Bible Nso (IGBOB)

11. N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala,Ha achipuwo kwa bridle n'irum.

12. N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili;Ukwum abua ka ha nupuworo,We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.

13. Ha emebiwo uzọm,Ha bara nmebim urù,Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.

14. Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia:N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum.

15. Ihe-egwu echighariwo imegidem,Ha nāchu ọkakam dika ifufe;Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.

16. Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri;Ubọchi nweda-n'ala nējidem.

17. N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum,Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.

18. Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari:Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.

19. Ọ tubàwom n'apiti,M'we yie ájá na ntu.

20. Anametiku Gi, ma I dighi-azam:Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.

21. I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere:I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.

22. I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya,I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.

23. N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru,Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.

24. N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide;Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia.

25. Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike?Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye?

26. Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra;M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara.

Job 30