11. N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala,Ha achipuwo kwa bridle n'irum.
12. N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili;Ukwum abua ka ha nupuworo,We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.
13. Ha emebiwo uzọm,Ha bara nmebim urù,Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.
14. Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia:N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum.
15. Ihe-egwu echighariwo imegidem,Ha nāchu ọkakam dika ifufe;Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.
16. Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri;Ubọchi nweda-n'ala nējidem.