Job 3:6-15 Bible Nso (IGBOB)

6. Abali ahu, ka oké ọchichiri jide ya:Ka ọ ghara iṅuri ọṅu n'etiti ubọchi nile nke arọ;Ka ọ ghara ibata n'ọnu-ọgugu ọnwa.

7. Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà;Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya.

8. Ka ha bua ya ọnu, bú ndi nābu ubọchi ọnu,Ndi nọ na njikere ikpọte leviathan.

9. Ka kpakpando nile nke emumechi-ya b͕a ọchichiri:Ka ọ le anya ìhè, ìhè adighi kwa;Ka ọ ghara ile mbuboro-anya nke chi-ọbubọ anya:

10. N'ihi na o mechighi ọnu-uzọ afọ nke m'si nime ya puta,O zopughi kwa ọnọdu ọjọ n'anyam.

11. N'ìhi gini ka m'nēsighi n'àkpà-nwa nwua?N'ìhi gini ka m'nāputaghi n'afọ kubìe ume?

12. Gini mere ikperè abua di n'irum inaram?Ma-ọbu ara, ka m'we ṅua?

13. N'ihi na ub͕u a ka m'gēdinawori di jūM'gāraruwori ura; mb͕e ahu ka izu-ike gādirim:

14. Mu na ndi-eze na ndi-ndum-ọdu nke uwa,Ndi nēwuru onwe-ha nkpọnkpọ ebe;

15. Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo,Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha:

Job 3