Job 3:15-23 Bible Nso (IGBOB)

15. Ma-ọbu mu na ndi-isi ndi nwere ọla-edo,Ndi nēmeju ulo-ha n'ọla-ọcha:

16. Ma-ọbu gini mere m'nādighi ka nwa amukworo amukwo nke ezoworo ezo;Dika umu ọhu nke nāhughi ìhè?

17. N'ebe ahu ka ndi nēmebi iwu rapuworo ime nkpatu;Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi ike gwuru nēzu ike.

18. N'ebe ahu ka ndi-nkpọrọ nānọkọ jū;Ha anughi olu ndi nāchi ha n'ihe-ike.

19. Onye ntà na onye uku nọ n'ebe ahu, ha abua;Orù apuwo kwa n'aka onye-nwe-ya nwere onwe-ya.

20. N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè?N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?

21. Ndi nēchere ọnwu, ma ọ dighi-abia;Ha nēgwu kwa ala-ya kari àkù zoro ezo;

22. Ndi nāṅuri rue otite-egwú-ọṅù,Obi nātọ kwa ha utọ mb͕e ha chọtara ílì.

23. N'ìhi gini ka O nēnye nwoke nke ezoworo uzọ-ya ìhè,Bú onye Chineke b͕ochiwo-kwa-ra ya?

Job 3