Job 28:5-14 Bible Nso (IGBOB)

5. Ala, nime ya ka nri si aputa:Ma n'okpuru ya ka atughariworo ya dika ọ bu ọku mere ya.

6. Ọnọdu sapphire ka nkume-ya nile bu,Ọ nwe-kwa-ra ájá ọla-edo.

7. Ọ bu uzọ nke udele nāmaghi,Anya agu-nkwọ ahughi kwa ya:

8. Anu-ọhia di nganga azọghi ya ukwu,Ọdum nāb͕ọ uja agabigaghi kwa n'elu ya.

9. Oké nkume ọmu ka o setipuworo aka-ya imegide;Okpùwo ugwu iru site na nkpọrọgwu-ha.

10. N'oké nkume nile ka ọ waputaworo uzọ miri si erù;Anya-ya ahuwo kwa ihe ọ bula di oké ọnu-ahia.

11. O kechiwo osimiri ka ha ghara itu miri;Ihe-nzuzo ka ọ nēme kwa ka ọ puta ìhè.

12. Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?

13. Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya;Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu.

14. Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di:Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam.

Job 28