1. N'ihi na ebe ọla-ọcha si aputa di,Na ebe nke diri ọla-edo ahu ha nānucha anucha.
2. Anēsi n'ájá eweputa ígwè,Anāwu kwa nkume ighọ ọla.
3. Madu emewo ọchichiri ka o nwe ọgwugwu,Rue nsọtu nile ka ya onwe-ya nēgwuputa kwaNkume nke oké ọchichiri na onyinyo ọnwu.
4. O siwo n'ebe madu nọ dika ọbìa tua ọnu;Ha bu ndi ukwu nke nāga aga nēchezọ;Anākwuba ha udọ̀ n'ebe di madu anya, ha nākwufeghari.