1. Job we za, si,
2. Ì siwo aṅa yere ya aka, bú onye nēnweghi ike?Í siwo aṅa zọputa ogwe-aka nke ume nādighi?
3. Ì siwo aṅa dua ya ọdu, bú onye nāmaghi ihe?Ì siwo kwa aṅa me ka amara nzube-ihe n'uba?
4. Ònye ka i gosiworo okwu?Ọ̀ bu kwa onye ume-ya siri nime gi puta?
5. Ndi nādighi ndu nāma jijijiN'okpuru miri na ihe nile nēbi nime ya.