14. Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye;N'abali kwa ọ di ka onye-ori.
15. Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama,Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim:Ọ nēzobe iru-ya.
16. O gwupúwo ulo n'ọchichiri:N'ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ;Ha amaghi ìhè.
17. N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu;N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu.
18. Onye di nfe n'elu miri ka ọ bu;Anākọcha òkè-ha n'uwa:Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru.
19. Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n'ike:Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo.
20. Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri;Agaghi-echeta kwa ya ọzọ:Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.
21. Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa;Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma.